Onyeisi WHO: Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri COVID-19, anyị ga-ebu ụzọ nye ibe anyị aka

Onyeisi Otu Ahụike Mbaụwa (WHO), Tedros Adhanom Ghebreyesu, sị na anyị nwere ike ịga n’ihu ma ọ bụrụ na mba niine kwere ịnye ibe ha aka.

COVID-19 bidoro na Chaịna n’ahọ 2019 mana o na-emegbu ụwa niine. Ọya nka emetụtara mmadụ nde 287. Ndị nwụrụ n’aka COVID-19 agafego nde ise.

Ghebreyesu kwuru maka mbọ ndị WHO gbara mana ọ sị na ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri COVID-19, anyị kwesịrị ịme ka mba niine nwe ọgwụmgbochi zuru oke.

Ọ sị: “Anyị kwụsị ikpe na-ezighị ezi, anyị akwụsị ọya a.’

Nka dị Afrịka ezigbo mkpa. N’ahọ 2021 WHO kwuru na ha chọrọ ka mmadụ 40% n’ime mba niine gba ọgwụmgbochi COVID-19. Sọsọ mmadụ 9% n’ime Afrịka niine agbago ọgwụmgbochi COVID-19. N’obodo Naịjirịa sọsọ mmadụ 2.1% agbago ya.

Ghebreyesu gwara anyị ihe WHO chọrọ n’ahọ 2022: ka ọ bụrụ na mmadụ 70% na mba niine agbago ọgwụmgbochi tupu Julaị.

Write a comment ...

Nneka

Show your support

Ọ bụ na ihe m na-ede na-atọ gị ụtọ, ị nwere ike ịnye aka. Daalụ!

Write a comment ...